IG/Prabhupada 0005 - Ndu Srila Prabhupada biri na minute ato



Interview -- September 24, 1968, Seattle

Onyenaju ajuju: Gwagodum ihe maka gi? Nya bu, ebee ka gi jere akwukwo, kedu otu gi siri were buru nwa aturu Krishna.

Prabhupāda: Nnem murum na Calcutta. Calcutta bu obodom. Amurum na aro 1896, nnam hurum naya nke ukuu, ije akwukwom ebidoro na oge, mana, ejerem akwukwo na nnukwu ulo akwukwo, anorom aro isato na nnukwu ulo akwukwo. Anorom aro ano na obere ulo akwukwo, nnukwu ulo akwukwo, aro asato, na ulo akwukwo mahadum, aro ano. Abanyerem ndi otu Ghandhi, ndi otu maka oganiru obodo. Na ezigbo ihe mere nwere hu Guru Maharaja mu, onye nkuzi nso mu, na aro 1922. Site na ubochi ahu, uchemu nile banyere na ihe masara Chukwu Ukwu nwayo nwayo ahapurumu ihe masara ezi na ulo. anurum nwayi mgbe nno aro ato nu ulo akwukwo na aho 1918. Enwerem umuaka. Anam azu ahia Abanyerem ezumike nka na ihe masara ezi na ulo na 1954. Anom sosom aho ano, enweyim ezi na ulo. Na 1959 abanyerem nu usoro ndi juru uwa anapko sannyasa. Ogem nile banyere na ide akwukwo. Akwukwo nge mbu putara na 1962, mgbe akwukwo ndere di ato, nwere biaba obodo unu na 1965, eluterem na September 1965. Site na mgbe ahu, anam agbambo ikwusa ozi oma Krishna na obodo America, Canada, na obodo ndi di na Europe. Nwayo nwayo ayi na emekpe ebe nzuko na ebe di iche iche. Anyi ne enweta umu azu ri nne. Kamu hu ihe gaje ime.

Onye ajuju: kedu otu gi onwe gi siri buru onye umu azu? Onye ka ibu, kedu ihe ina eso tupu iburu onye banyere nu umu azu?

Prabhupāda: Obu otu ihe mgwaburu gi, okwukwe. Otu enyim, obuya ji ike kpogam ihu onye nkuzi nsom. Mgbem kpara nkata mu na onye nkuzi nsoaa, nkata ayi jurum afo. Site nu ubochi ahu, , ihe nkpuruaa bidoro.