IG/Prabhupada 0007 - Krishna Ga Eledo



Lecture on SB 1.5.22 -- Vrndavana, August 3, 1974

Brahmānanda: Brahmana agaghii anara ilu olu obula.

Prabhupāda: Mbanu. Oga anwu na aguu. Ogaghii anara olu obula. Ya bu brahmana Onye Ksatriya kwa, onye vaisya kwa. Sooso onye sudra onye vaisya ga acho azumaahia obula. Oga acho azumaahia. Onwere akuko iro so ya. Otu nwoke aha ya bu Mazi Nandi, mgbe di nnukwu anya, na obodo Calcutta, ojere hu ndi enyi ya, "oburu na iga agbaziyem obere ego isi, agam ebido azumaahia." Nwokeaa siri ya, "ibu onye vaisya? Onye azumaahia "Eee." Ina anyom ego? Ego di na okporo uzo. Iga ahukwa ya na ebeaa" Osiri ya, “ahukwayim ya;" "Ihughii ya? Gini bu nkeaa? "Nkeaa bu oke nwuru anwu." "Nkeaa bu ego mbido ina acho." Lee nu.

Otu mgbe ahu na Calcutta enwere oria na efefe, oria nfufe no na ya. Iwu ndi ochichi municipality bu na onye obula wetara oke nwuru anwu, aga akwu ya nkpuru ego annas abuaa. nwoke ahu were oke ahu nwuru anwu jee na ulo ndi municipality. Akwuru ya nkpuru ego annas abuaa. ojiri nkpuru ego annas abuaa ahu were goro betel nuts mebiri emebi, osara ya were leeya nkpuru ego annas ano, nkpuru ego annas ise. Otuaa ka, ugboro, ugboro, ugboro, nwoke ahu buru ogaranya. Otu nime ezi na ulo ya bu nwanne ayi na Chukwu. Ezi na ulo Nandi Ezi na ulo ndi Nandi, ha nwere nderi ano, nderi nmadu ise na eri nri kwa ubochi. Nnukwu ogaranya. Iwu dina ezi na ulo ha bu na amuaa nwoke ma obu nwanyi, aga etinye puku rupees ise na ebe ana edobe ego, mgbe ona eme emume inu nwanyi, puku rupees ise ahu na nwa omutara, oga ewere ya. Onweghiikwa nketa na ego isi. Onye obula bikwa na ezi na uloaa, ga enwekwa nri oriri na ulo. Nkeaa bu nkeha... Makwa onye mbu, mba achorom ikwu, onye bidoro ezi na uloaa, Nandi, obidoro azumaahia ya sitena oke nwuru anwu.

Nkeaa bukwa ezi okwu, nke mere eme, na oburu na nmadu choro ibiri na onwe ya... Na Calcutta ahukwaram. Ndi ogbeye bukwa ndi vaisya, na uzo ututu ha ga eburu obere dal, akpa dal, jee nu ulo nu ulo. Dal bukwa ihe ana acho ne ebenile. Nu uzo ututu ozuoo aghiaa dal, na uchichi onwere otu oyoko nmanu kerosene. Na uchichi onye obula na acho. Ahukwa nkeaa na obodo India, ha... Onwero onye na acho olu. Obere, ihe obula onwere, na izu ahia ihe ana atata bu groundnut ma obu peanuts. Obu ihe ona alu. Krishna na eledo onye obula anya. Obukwa amaghi ihe isi na "Nwokeaa bu onye na eledom anya" Mbanu, akwukwo nso kwuru, eko yo bahūnāṁ vidadhāti kāmān. Ichekwudo Krishna, ya Krishna nyerem ndu, Krishna ziterem ebeaa. Ya bu, oga eledom anya. Ya bu, otu ikem ha, agam eme ihe, site na ihe ndiaa, Krishna ga eledom anya."